Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 14:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa ka unu gēri:

10. ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa, unu erila ya; ihe-árú ka ọ buru unu.

11. Nnunu ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.

12. Ma ndia bu nnunu unu agaghi-eri ihe sitere n'anu-ha: ugo, na ugo-agwọ, na ugo-azù;

13. na udele, na agu-nkwọ, na ndab͕u di iche iche;

14. na ugolo-ọma ọ bula di iche iche;

15. na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;

16. na okwukwu ntà, na okwukwu uku, na okwukwu nwere mpi;

17. na okwolo, na udele, na cormorant;

18. na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 14