9. Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa ka unu gēri:
10. ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa, unu erila ya; ihe-árú ka ọ buru unu.
11. Nnunu ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.
12. Ma ndia bu nnunu unu agaghi-eri ihe sitere n'anu-ha: ugo, na ugo-agwọ, na ugo-azù;
13. na udele, na agu-nkwọ, na ndab͕u di iche iche;
14. na ugolo-ọma ọ bula di iche iche;
15. na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;
16. na okwukwu ntà, na okwukwu uku, na okwukwu nwere mpi;
17. na okwolo, na udele, na cormorant;
18. na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.