isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 14 Bible Nso (IGBOB)

1. Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu.

2. N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi, ọ bu kwa gi ka Jehova rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.

3. Erila ihe-árú ọ bula.

4. Ndia bu anumanu nke unu gēri: ehi, na aturu, na ewu,

5. na ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ewu ọhia, na atu, na anigọ, na uturu.

6. Anumanu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara abua, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.

7. Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, na hare, na coney, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ha bu, ma ha abughi ihe ukwu wara njakpa, ihe ruru árú ka ha buru unu:

8. ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa ka ọ bu, ma ọ bughi ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu: unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka.

9. Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa ka unu gēri:

10. ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa, unu erila ya; ihe-árú ka ọ buru unu.

11. Nnunu ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.

12. Ma ndia bu nnunu unu agaghi-eri ihe sitere n'anu-ha: ugo, na ugo-agwọ, na ugo-azù;

13. na udele, na agu-nkwọ, na ndab͕u di iche iche;

14. na ugolo-ọma ọ bula di iche iche;

15. na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;

16. na okwukwu ntà, na okwukwu uku, na okwukwu nwere mpi;

17. na okwolo, na udele, na cormorant;

18. na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.

19. Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, ihe-árú ka ọ buru unu; agaghi-eri ha.

20. Anu-ufe ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.

21. Unu erila ihe nwuru onwe-ya: ọ bu ọbìa nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula ka i gēnye ya, ka ọ we rie ya; ma-ọbu i gērenye ya onye ala ọzọ: n'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

22. I ghaghi inye otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n'ubi-gi puta kwa-arọ.

23. I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.

24. Ma mb͕e uzọ ahu gādikari gi anya, i we ghara ipu ibū ya, n'ihi na ebe ahu dipuru anya n'ebe i nọ, bú ebe nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi:

25. i gēnye kwa ya n'ego, ke ego ahu n'aka-gi, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa:

26. i gēnye kwa ego ahu n'ihe ọ bula nke agu ya nāgu nkpuru-obi-gi, n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu, ma-ọbu na manya-vine, ma-ọbu n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ma-ọbu n'ihe ọ bula nkpuru-obi-gi nāriọ n'aka-gi: i gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ṅuri kwa ọṅu, gi onwe-gi na ulo-gi:

27. ma onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, arapula ya; n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe.

28. N'ọgwugwu arọ atọ i gēweputa otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'otù arọ ahu, dọba kwa ya nime ọnu-uzọ-ama-gi nile:

29. onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.