Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 14:24-29 Bible Nso (IGBOB)

24. Ma mb͕e uzọ ahu gādikari gi anya, i we ghara ipu ibū ya, n'ihi na ebe ahu dipuru anya n'ebe i nọ, bú ebe nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi:

25. i gēnye kwa ya n'ego, ke ego ahu n'aka-gi, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa:

26. i gēnye kwa ego ahu n'ihe ọ bula nke agu ya nāgu nkpuru-obi-gi, n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu, ma-ọbu na manya-vine, ma-ọbu n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ma-ọbu n'ihe ọ bula nkpuru-obi-gi nāriọ n'aka-gi: i gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ṅuri kwa ọṅu, gi onwe-gi na ulo-gi:

27. ma onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, arapula ya; n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe.

28. N'ọgwugwu arọ atọ i gēweputa otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'otù arọ ahu, dọba kwa ya nime ọnu-uzọ-ama-gi nile:

29. onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 14