Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 14:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.

19. Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, ihe-árú ka ọ buru unu; agaghi-eri ha.

20. Anu-ufe ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.

21. Unu erila ihe nwuru onwe-ya: ọ bu ọbìa nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula ka i gēnye ya, ka ọ we rie ya; ma-ọbu i gērenye ya onye ala ọzọ: n'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

22. I ghaghi inye otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n'ubi-gi puta kwa-arọ.

23. I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.

24. Ma mb͕e uzọ ahu gādikari gi anya, i we ghara ipu ibū ya, n'ihi na ebe ahu dipuru anya n'ebe i nọ, bú ebe nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi:

25. i gēnye kwa ya n'ego, ke ego ahu n'aka-gi, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa:

26. i gēnye kwa ego ahu n'ihe ọ bula nke agu ya nāgu nkpuru-obi-gi, n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu, ma-ọbu na manya-vine, ma-ọbu n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ma-ọbu n'ihe ọ bula nkpuru-obi-gi nāriọ n'aka-gi: i gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ṅuri kwa ọṅu, gi onwe-gi na ulo-gi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 14