Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 14:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu.

2. N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi, ọ bu kwa gi ka Jehova rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.

3. Erila ihe-árú ọ bula.

4. Ndia bu anumanu nke unu gēri: ehi, na aturu, na ewu,

5. na ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ewu ọhia, na atu, na anigọ, na uturu.

6. Anumanu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara abua, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 14