Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 14:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu.

2. N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi, ọ bu kwa gi ka Jehova rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.

3. Erila ihe-árú ọ bula.

4. Ndia bu anumanu nke unu gēri: ehi, na aturu, na ewu,

5. na ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ewu ọhia, na atu, na anigọ, na uturu.

6. Anumanu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara abua, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.

7. Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, na hare, na coney, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ha bu, ma ha abughi ihe ukwu wara njakpa, ihe ruru árú ka ha buru unu:

8. ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa ka ọ bu, ma ọ bughi ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu: unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka.

9. Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa ka unu gēri:

10. ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa, unu erila ya; ihe-árú ka ọ buru unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 14