Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 13:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. kama i ghaghi ib͕u ya; aka-gi gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu.

10. I gēwere nkume tub͕ue ya, ka o we nwua; n'ihi na ọ chọwo iduhie gi n'akuku Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta.

11. Israel nile gānu kwa, we tua egwu, ha agaghi-eme kwa ọzọ dika ihe ọjọ a si di n'etiti gi.

12. Mb͕e i gānu okwu n'otù nime obodo-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibi n'ebe ahu, si,

13. Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);

14. i gāju kwa ase, gwu ala-ya, juta nke-ọma; ma, le, asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'etiti gi;

15. i ghaghi iwere ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi n'obodo ahu, were mma-agha wezuga ya, na ihe nile di nime ya, na anu-ulo-ya, ka ebibie ya.

16. I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.

17. Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;

18. mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 13