isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 13 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e onye-amuma ma-ọbu ọrọ-nrọ gēbili n'etiti gi, nye gi ihe-iriba-ama ma-ọbu ihe-ebube,

2. ihe-iriba-ama ahu ma-ọbu ihe-ebube ahu we me, nke ọ gwara gi okwu bayere ya, si, Ka ayi jeso chi ọzọ n'azu, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha), ka ayi fè kwa ha òfùfè;

3. egela nti okwu onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nānwà unu, ima ma unu nēwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile hu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya.

4. Jehova, bú Chineke-unu, ka unu ganējeso n'azu, Ya ka unu gātu egwu, ihe nile O nyere n'iwu ka unu gēdebe, olu-Ya ka unu gēge nti, Ya ka unu gēfè òfùfè, Ya ka unu gārapara n'aru.

5. Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

6. Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà;

7. ndi sitere na chi nile nke ndi nile nọ unu buruburu, ndi nọ nso gi, ma-ọbu ndi nọpuru gi n'ebe di anya, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa);

8. ekwela ya, ege-kwa-la ya nti; anya-gi agaghi-emere ya ebere, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya, ekpuchi-kwa-la ya:

9. kama i ghaghi ib͕u ya; aka-gi gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu.

10. I gēwere nkume tub͕ue ya, ka o we nwua; n'ihi na ọ chọwo iduhie gi n'akuku Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta.

11. Israel nile gānu kwa, we tua egwu, ha agaghi-eme kwa ọzọ dika ihe ọjọ a si di n'etiti gi.

12. Mb͕e i gānu okwu n'otù nime obodo-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibi n'ebe ahu, si,

13. Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);

14. i gāju kwa ase, gwu ala-ya, juta nke-ọma; ma, le, asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'etiti gi;

15. i ghaghi iwere ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi n'obodo ahu, were mma-agha wezuga ya, na ihe nile di nime ya, na anu-ulo-ya, ka ebibie ya.

16. I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.

17. Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;

18. mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.