3. unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu.
4. Unu emerela Jehova, bú Chineke-unu, otú a.
5. Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu:
6. ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu:
7. unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.
8. Unu emela dika ihe nile si di nke ayi onwe-ayi nēme n'ebe a ta, nwoke ọ bula ọ nēme ihe ziri ezi n'anya-ya:
9. n'ihi na unu akābaghi rue ub͕u a n'izu-ike ahu, na n'ihe-nketa ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
10. Ma mb͕e unu gabigara Jọdan, biri n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu keta, mb͕e O mesi-kwa-ra ka unu zuru ike pua n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi;
11. ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:
12. unu gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu onwe-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na orù-unu ndikom, na orù-unu ndinyom, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-unu ọ bula; n'ihi na o soghi unu nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa.
13. Lezie onwe-gi anya ka i ghara isure àjà-nsure-ọku-gi n'ebe ọ bula i gāhu:
14. kama n'ebe nke Jehova gārọputa n'otù nime ebo-gi, n'ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu.
15. Otú ọ di, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi ka i gēb͕u, ri kwa anu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika ngọzi nke Jehova, bú Chineke-gi, nke O nyeworo gi, si di: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ya: dika mb͕ada, na dika ele.