Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 12:14-27 Bible Nso (IGBOB)

14. kama n'ebe nke Jehova gārọputa n'otù nime ebo-gi, n'ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu.

15. Otú ọ di, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi ka i gēb͕u, ri kwa anu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika ngọzi nke Jehova, bú Chineke-gi, nke O nyeworo gi, si di: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ya: dika mb͕ada, na dika ele.

16. Nání na unu agaghi-eri ọbara; i gāwusi ya n'ala dika miri.

17. I pughi iri n'ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi:

18. kama ọ bu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula.

19. Lezie onwe-gi anya ka i ghara irapu onye Livai ubọchi-gi nile n'elu ala-gi.

20. Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ókè-ala-gi sa mbara, dika Ọ gwara gi, i we si, Ka m'rie anu, n'ihi na agu nāgu nkpuru-obi-gi iri anu; n'agu nile nke nkpuru-obi-gi i gēri anu.

21. Mb͕e ọ gādikari gi anya, bú ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, i gēb͕u kwa ufọdu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, nke Jehova nyeworo gi, dika m'nyeworo gi iwu, i gēri kwa n'ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi.

22. Nání, dika anēri mb͕ada na ele, otú a ka i gēri ha: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ha n'otù uzọ ahu.

23. Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n'ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu.

24. Erila ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.

25. Erila ya; ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.

26. Nání ihe nsọ gi nile nke i nwere, na ihe-nkwa-gi nile, ka i gēbuli, biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa:

27. i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n'ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 12