Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 11:7-17 Bible Nso (IGBOB)

7. ma ọ bu anya-unu nāhu omume uku nile nke Jehova, nke O meworo.

8. Unu gēdebe kwa ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka unu we di ike, ba nime, nweta ala ahu, ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;

9. ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya.

10. N'ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige:

11. ma ala ahu, ebe unu nāgabiga inweta ya, bu ala ugwu na ndagwurugwu; site na miri-ozuzo nke elu-igwe ka ọ nāṅu miri:

12. ọ bu ala nke di Jehova, bú Chineke-gi, n'obi; mb͕e nile ka anya Jehova, bú Chineke-gi, nādikwasi ya, site na mb͕e mbu nke arọ we rue mb͕e ikpe-azu nke arọ.

13. O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,

14. na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.

15. M'gēnye kwa anu-ulo-gi ihe-ọkuku n'ubi-gi, i gēri kwa, afọ gēju kwa gi.

16. Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha;

17. iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 11