isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 11 Bible Nso (IGBOB)

1. I gāhu kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, debe ihe-ndebe-Ya, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, na ihe nile Ọ nyere n'iwu, ubọchi-gi nile.

2. Ma unu amawo ta: n'ihi na ọ bughi umu-unu ka m'nāgwa okwu, bú ndi nāmaghi, ndi nāhughi kwa idọ-aka-na-nti nke Jehova, bú Chineke-unu, na idi-uku-Ya, na aka-Ya di ike, na ogwe-aka-Ya esetiri eseti,

3. na ihe-iriba-ama-Ya nile, na omume-Ya nile, nke Ọ mere Fero eze Ijipt, me kwa ala-ya nile, n'etiti Ijipt;

4. na ihe O mere usu-ndi-agha Ijipt, me kwa inyinya-ha, me kwa ub͕ọ-ala-ha; mb͕e O mere ka miri Oké Osimiri Uhie rukpuchie iru-ha mb͕e ha nāchu unu n'azu, Jehova we me ka ha la n'iyì rue ta;

5. na ihe O mere unu n'ọzara, rue mb͕e unu biaruru ebe a;

6. na ihe O mere Detan na Abairam, umu Eliab, nwa Reuben; mb͕e ala saghepuru ọnu-ya, loda ha, na ezi-na-ulo nile ha, na ulo-ikwū nile ha, na ihe ọ bula di ndu nke di n'ukwu-ha, n'etiti Israel nile:

7. ma ọ bu anya-unu nāhu omume uku nile nke Jehova, nke O meworo.

8. Unu gēdebe kwa ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka unu we di ike, ba nime, nweta ala ahu, ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;

9. ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya.

10. N'ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige:

11. ma ala ahu, ebe unu nāgabiga inweta ya, bu ala ugwu na ndagwurugwu; site na miri-ozuzo nke elu-igwe ka ọ nāṅu miri:

12. ọ bu ala nke di Jehova, bú Chineke-gi, n'obi; mb͕e nile ka anya Jehova, bú Chineke-gi, nādikwasi ya, site na mb͕e mbu nke arọ we rue mb͕e ikpe-azu nke arọ.

13. O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,

14. na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.

15. M'gēnye kwa anu-ulo-gi ihe-ọkuku n'ubi-gi, i gēri kwa, afọ gēju kwa gi.

16. Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha;

17. iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.

18. Unu gēdo kwa okwu ndia n'obi-unu na nime nkpuru-obi-unu; unu gēke kwa ha n'elu aka-unu ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-unu.

19. Unu gēzí umu-unu ha, n'ikwu okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.

20. I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile:

21. ka ubọchi-unu we ba uba, ha na ubọchi umu-unu, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, dika ubọchi elu-igwe nke di n'elu uwa.

22. N'ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na irapara n'aru Ya;

23. Jehova gānapu kwa mba ndia nile ala-ha n'iru unu, unu gēnweta kwa mba di iche iche di uku di kwa ike kari unu.

24. Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu.

25. Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.

26. Le, mu onwem nētiye n'iru unu ta ngọzi na nkọcha;

27. ngọzi ahu, ma asi na unu ege nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta:

28. ma nkọcha ahu, ma ọ buru na unu egeghi nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, ma unu ewezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ka unu we jeso chi di iche iche ọzọ, nke unu nāmaghi.

29. Ọ gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, na i gētiye ngọzi ahu n'elu ugwu Geraizim, tiye kwa nkọcha ahu n'elu ugwu Ibal.

30. Ugwu ndia, hà adighi n'ofè Jọdan, n'azu uzọ ọdida-anyanwu, n'ala ndi Kenean ndi bi n'Araba, na ncherita-iru Gilgal, n'akuku osisi terebinth nke More?

31. N'ihi na unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu, unu gēnweta kwa ya, biri nime ya.

32. Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n'iru unu ta.