Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 11:29-32 Bible Nso (IGBOB)

29. Ọ gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, na i gētiye ngọzi ahu n'elu ugwu Geraizim, tiye kwa nkọcha ahu n'elu ugwu Ibal.

30. Ugwu ndia, hà adighi n'ofè Jọdan, n'azu uzọ ọdida-anyanwu, n'ala ndi Kenean ndi bi n'Araba, na ncherita-iru Gilgal, n'akuku osisi terebinth nke More?

31. N'ihi na unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu, unu gēnweta kwa ya, biri nime ya.

32. Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n'iru unu ta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 11