Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 11:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. I gāhu kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, debe ihe-ndebe-Ya, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, na ihe nile Ọ nyere n'iwu, ubọchi-gi nile.

2. Ma unu amawo ta: n'ihi na ọ bughi umu-unu ka m'nāgwa okwu, bú ndi nāmaghi, ndi nāhughi kwa idọ-aka-na-nti nke Jehova, bú Chineke-unu, na idi-uku-Ya, na aka-Ya di ike, na ogwe-aka-Ya esetiri eseti,

3. na ihe-iriba-ama-Ya nile, na omume-Ya nile, nke Ọ mere Fero eze Ijipt, me kwa ala-ya nile, n'etiti Ijipt;

4. na ihe O mere usu-ndi-agha Ijipt, me kwa inyinya-ha, me kwa ub͕ọ-ala-ha; mb͕e O mere ka miri Oké Osimiri Uhie rukpuchie iru-ha mb͕e ha nāchu unu n'azu, Jehova we me ka ha la n'iyì rue ta;

5. na ihe O mere unu n'ọzara, rue mb͕e unu biaruru ebe a;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 11