10. Mu onwem guzo-kwa-ra n'ugwu ahu, dika na mb͕e mbu, ọgu ubọchi abua, ehihie na abali: Jehova we gekwam nti na mb͕e ahu; Jehova achọghi ibibi gi.
11. Jehova we sim, Bilie, je ka i bulie ije n'iru ndi nkem; ha gābà kwa, nweta ala ahu, nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha.
12. Ma ub͕u a, Israel, gini ka Jehova, bú Chineke-gi, nāriọ n'aka-gi, ma-ọbughi itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ije ije n'uzọ-Ya nile, na ihu Ya n'anya, na iwere obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile fè Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè,
13. idebe ihe nile Jehova nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta ka ọ we diri gi nma?
14. Le, Jehova, bú Chineke-gi, nwe elu-igwe, na elu-igwe nke elu-igwe nile, na uwa, na ihe nile nke di nime ya.
15. Nání na ihe nna-unu-hà di Jehova ezi utọ ka O we hu ha n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, bú unu onwe-unu, n'etiti ndi nile, otú ọ di ta.
16. Bì-kwa-nu obi-unu úgwù, unu abu-kwa-la ndi kwesiri olu ike ọzọ.
17. N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo.
18. Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.
19. Hu-kwa-nu ọbìa n'anya: n'ihi na ọ bu ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.
20. Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.
21. Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo.
22. Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.