Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 1:39-46 Bible Nso (IGBOB)

39. Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe alutara n'agha, na umu-unu ndikom, ndi nāmaghi ezi ihe na ihe ọjọ ta, ndi ahu gābà n'ebe ahu, ha ka M'gēnye kwa ya, ha onwe-ha gēnweta kwa ya.

40. Ma unu onwe-unu, chenu iru, bulie ije, ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie.

41. Unu we za, sim, Ayi emehiewo megide Jehova, ayi onwe-ayi gārigo, bū agha, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi n'iwu. Unu we ke, nwoke ọ bula ihe-agha-ya, we kpọ ya ihe nfe irigo n'ugwu ahu.

42. Jehova we sim, Si ha, Unu arigola, unu ebu-kwa-la agha; n'ihi na Mu anọghi n'etiti unu; ka aghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu.

43. M'we gwa unu okwu, ma unu anughi; ma unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, we were nganga rigorue ugwu ahu.

44. Ndi-Amorait, ndi bi n'ugwu ahu, we puta izute unu, ha we chua unu, dika anwu si eme, we zọpia unu nime Sia, rue Họma.

45. Unu we laghachi, kwa ákwá n'iru Jehova; ma Jehova egeghi nti n'olu-unu, Ọ ṅaghi kwa unu nti.

46. Unu we biri na Kedesh ọtutu ubọchi, dika ubọchi nile si di nke unu biri n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 1