Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 1:36-44 Bible Nso (IGBOB)

36. ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M'gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M'gēnye kwa umu-ya: n'ihi na o sozuwo Jehova n'azu

37. Ọ bu kwa mu ka Jehova wesara iwe n'ihi unu, si, Gi onwe-gi kwa, i gaghi-abà n'ebe ahu:

38. Joshua nwa Nun, nke nēguzo n'iru gi, ya onwe-ya gābà n'ebe ahu: gi me ya ka ọ di ike; n'ihi na ya onwe-ya gēme ka Israel keta ya.

39. Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe alutara n'agha, na umu-unu ndikom, ndi nāmaghi ezi ihe na ihe ọjọ ta, ndi ahu gābà n'ebe ahu, ha ka M'gēnye kwa ya, ha onwe-ha gēnweta kwa ya.

40. Ma unu onwe-unu, chenu iru, bulie ije, ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie.

41. Unu we za, sim, Ayi emehiewo megide Jehova, ayi onwe-ayi gārigo, bū agha, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi n'iwu. Unu we ke, nwoke ọ bula ihe-agha-ya, we kpọ ya ihe nfe irigo n'ugwu ahu.

42. Jehova we sim, Si ha, Unu arigola, unu ebu-kwa-la agha; n'ihi na Mu anọghi n'etiti unu; ka aghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu.

43. M'we gwa unu okwu, ma unu anughi; ma unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, we were nganga rigorue ugwu ahu.

44. Ndi-Amorait, ndi bi n'ugwu ahu, we puta izute unu, ha we chua unu, dika anwu si eme, we zọpia unu nime Sia, rue Họma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 1