Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 1:33-39 Bible Nso (IGBOB)

33. Onye nēje n'iru unu n'uzọ ahu, ileputara unu ebe ima ulo-ikwū-unu, n'ọku n'abali, ime ka unu hu uzọ nke unu gēje nime ya, na n'igwé-oji ahu n'ehihie.

34. Jehova we nu olu okwu nile unu, O we we iwe, ṅua iyi, si,

35. Ọ dighi otù nwoke nime ndikom ndia nke ọb͕ọ ọjọ nka gāhu ezi ala ahu ma-ọli, bú ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha,

36. ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M'gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M'gēnye kwa umu-ya: n'ihi na o sozuwo Jehova n'azu

37. Ọ bu kwa mu ka Jehova wesara iwe n'ihi unu, si, Gi onwe-gi kwa, i gaghi-abà n'ebe ahu:

38. Joshua nwa Nun, nke nēguzo n'iru gi, ya onwe-ya gābà n'ebe ahu: gi me ya ka ọ di ike; n'ihi na ya onwe-ya gēme ka Israel keta ya.

39. Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe alutara n'agha, na umu-unu ndikom, ndi nāmaghi ezi ihe na ihe ọjọ ta, ndi ahu gābà n'ebe ahu, ha ka M'gēnye kwa ya, ha onwe-ha gēnweta kwa ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 1