Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 9:14-25 Bible Nso (IGBOB)

14. Jehova we mua anya n'ebe ihe ọjọ ahu di, me ka ọ biakwasi ayi: n'ihi na Onye ezi omume ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu bayere ọlu-Ya nile nke Ọ luworo, ma ayi egeghi olu-Ya nti.

15. Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye wereworo aka di ike me ka ndi-Gi si n'ala Ijipt puta, I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta; ayi emehiewo, ayi emebiwo iwu.

16. Onye-nwe-ayi, dika ezi omume-Gi nile si di, biko, ka iwe-Gi na ọnuma-Gi si n'obodo-Gi, bú Jerusalem, bú ugwu nsọ Gi, laghachi: n'ihi na ọ bu n'ihi nmehie nile ayi, na n'ihi ajọ omume nile nke nna-ayi-hà, ka Jerusalem na ndi-Gi ghọworo ihe-ita-uta nye ndi nile di ayi buruburu.

17. Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ge nti n'ekpere orù-Gi na n'aririọ-amara-ya nile, me iru-Gi ka ọ mukwasi ebe nsọ Gi nke tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi Onye-nwe-ayi.

18. Chinekem, tọ nti-Gi n'ala, nu; saghe anya-Gi abua, hu ebe nile ayi nke tọb͕ọrọ n'efu, na obodo ahu nke akpọkwasiworo ya aha-Gi: n'ihi na ọ bughi n'ihi ezi omume nile ayi ka ayi onwe-ayi nēme ka aririọ-amara nile ayi da n'iru Gi, kama n'ihi ọtutu obi-ebere-Gi.

19. Onye-nwe-ayi, nuru: Onye-nwe-ayi, b͕aghara: Onye-nwe-ayi, ṅa nti me ihe: anọla ọdu: n'ihi Gi onwe-gi; Chinekem, n'ihi na aha-Gi ka akpọkwasiworo obodo-Gi na ndi-Gi.

20. Ma mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu, nēkpe ekpere, nēkwuputa nmehiem na nmehie ndim, bú Israel, nēme ka aririọ-amaram da n'iru Jehova, bú Chinekem, n'ihi ugwu nsọ nke Chinekem;

21. e, mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu n'ekpere, onye ahu, bú Gebriel, onye m'hururi n'ọhù n'isi-nmalite, ebe emere ka o feb͕ue onwe-ya n'ufe, o we nērutum aru n'ihe dika mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.

22. O we me ka m'ghọta, kpayerem uka, si, Daniel, ub͕u a ka m'putaworo ime ka i nwe uche ighọta ihe.

23. N'isi-nmalite aririọ-amara-gi nile ka okwu putara, mu onwem abiawo kwa igosi gi; n'ihi na ihe anāchọsi ike nke-uku ka i bu: ya mere tugharia uche n'okwu a, ghọta ọhù a.

24. Ọgu ízù atọ na iri, bú ízù ubọchi asa, ka ekpeworo n'ikpe bayere ndi-gi, baye-kwa-ra obodo nsọ gi, ime ka njehie bìe, na ime ka nmehie gwusia, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighi-ebi bata, na ikachita ọhù na omuma akàrà, na ite Onye nsọ ahu Nke kachasi ndi nsọ nile manu.

25. Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 9