N'isi-nmalite aririọ-amara-gi nile ka okwu putara, mu onwem abiawo kwa igosi gi; n'ihi na ihe anāchọsi ike nke-uku ka i bu: ya mere tugharia uche n'okwu a, ghọta ọhù a.