Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 8:12-23 Bible Nso (IGBOB)

12. Anēnye kwa ya usu-ndi-agha imegide àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum n'ihi nmehie; o we tuda ezi-okwu n'ala, me ihe, ihe ga-kwa-ra ya.

13. M'we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu?

14. O we sim, Rue nnù anyasi na ututu ise na ọgu iri-na-ise; ewe gua ebe nsọ n'ebe ezi omume.

15. O rue, mb͕e m'huru ọhù ahu, ọbuná mu onwem, bú Daniel, na m'chọrọ nghọta; ma, le, ihe di ka nwoke di ike n'ile ya anya nēguzo n'irum.

16. M'we nu olu madu n'etiti Ulai, o we kpọ, si, Gebriel, me ka onye a ghọta ọhùa.

17. O we bia nso n'ebe m'nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m'we tua egwu nke-uku, da kpue irum n'ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n'ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri.

18. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we di n'oké ura da kpue irum n'ala: o we metum aka, me ka m'guzo ọtọ n'ebe m'nēguzo.

19. O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile.

20. Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia.

21. Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.

22. Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n'ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n'ike-ya.

23. Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 8