Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 4:6-24 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon bata n'irum, ka ha we me ka m'mara isi nrọ ahu.

7. Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe batara: mu onwem we ze nrọ ahu n'iru ha; ma ha emeghi ka m'mara isi-ya.

8. Ma n'ikpe-azu Daniel batara n'irum, onye aha-ya bu Belteshaza, dika aha chim si di, onye mọ nke chi nsọ nile di kwa nime ya: ọ bu kwa n'iru ya ka m'zere nrọ ahu, si,

9. Belteshaza, onye-isi ndi-ode-akwukwọ di nsọ, n'ihi na mu onwem mara na mọ nke chi nsọ nile di nime gi, na ọ dighi ihe-nzuzo ọ bula nēsob͕u gi, kọrọm ọhù nile nke nrọm nke m'huworo, na isi-ya.

10. Ma ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam di otú a: anọm nāhu, ma le, otù osisi n'etiti uwa, idi-elu-ya di kwa uku.

11. Osisi ahu b͕ara ab͕a, di ike, idi-elu-ya rute-kwa-ra n'elu-igwe, apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile.

12. Akwukwọ-ya mara nma, nkpuru-ya ri-kwa-ra nne, ihe-oriri izùru ihe nile di kwa ya: n'okpuru ya ka anu ọhia nēze ǹdò, ọ bu kwa n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nēbi, esite kwa na ya zù anu-aru nile, bú madu.

13. Anọm nāhu n'ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam, ma, le, otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, nēsi n'elu-igwe rida.

14. Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n'okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n'alaka-ya fepu.

15. Ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu-ọhia n'ihe-ọkukú nke uwa:

16. ka obi-ya b͕anwe ghara ibu obi madu, ka enye kwa ya obi anu-ọhia; ka oge asa gabiga kwa ya n'isi.

17. N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.

18. Nrọ a ka mu onwem, bú eze, bú Nebukadneza, huworo: ma gi onwe-gi, Belteshaza, kọ akukọ-isi-ya, n'ihi na ndi-amam-ihe nile nke ala-ezem apughi ime ka m'mara isi-ya; ma gi onwe-gi puru, n'ihi na mọ nke chi nsọ nile di nime gi.

19. Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi.

20. Osisi ahu nke i huru, nke b͕ara ab͕a, nke di ike, nke idi-elu-ya rutere n'elu-igwe, nke apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile;

21. nke akwukwọ-ya mara nma, nke nkpuru-ya riri nne, nke ihe-oriri izuru ihe nile di ya; nke n'okpuru ya ka anu ọhia nēbi, nke ọ bu n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nwere ebe-obibi-ha:

22. gi onwe-gi ka ọ bu, eze, n'ihi na i bawo uba, di ike: idi-uku-gi abawo kwa uba, rute n'elu-igwe, ebe i nāchi erutewo kwa na nsọtu uwa.

23. Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n'elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n'isi ya;

24. nka bu akukọ-isi-ya, eze, iwu nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ bu kwa, nke ruteworo onye-nwem, bú eze, aru:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 4