Belteshaza, onye-isi ndi-ode-akwukwọ di nsọ, n'ihi na mu onwem mara na mọ nke chi nsọ nile di nime gi, na ọ dighi ihe-nzuzo ọ bula nēsob͕u gi, kọrọm ọhù nile nke nrọm nke m'huworo, na isi-ya.