Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 11:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọ gābata kwa n'ala-eze nke eze Ndida, ma ọ gālaghachi n'ala nke aka ya.

10. Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike.

11. Ma eze Ndida gēwe iwe di ilu, puta, buso ya agha, bú eze Ugwu ahu: ọ gēguzo kwa oké ìgwè madu, ma agēnye ìgwè madu ahu n'aká-ya.

12. Agāchipu kwa ìgwè madu ahu, obi-ya ewe di elu: ọ gēme kwa ka nnù kwuru nnù madu da ada, ma ọ gaghi-adi ike.

13. Ma eze Ugwu ahu gēguzobe kwa ìgwè madu ọzọ bara uba kari ìgwè mbu; ọ bu kwa n'ọgwugwu mb͕e ndia, bú nke arọ ndia, ka ọ gābia abia, chiri usu-ndi-agha di uku, chi kwa ọtutu àkù.

14. Ma na mb͕e ahu ka ọtutu madu gēguzo ọtọ imegide eze Ndida: ọzọ, umu nke ndi nēme ihe-ike n'etiti ndi-gi gēbuli onwe-ha ime ka ọhù ahu guzo; ma ha gāsu ngọngọ.

15. Eze Ugwu ahu gābia kwa, wukọta obo-ihe, were otù obodo nke ewusiri ike nke-uku: ogwe-aka nile nke Ndida agaghi-eguzo kwa, ha na ndi ọ rọputara, ọ dighi kwa ike ọ bula ha nwere iguzo.

16. Ma onye ahu nke nābiakute ya gēme ka o si tọ ya, ọ dighi kwa onye ọ bula ganēguzo n'iru ya; ọ gēguzo kwa n'ala ahu mara nma, ngwusi gādi kwa n'aka-ya.

17. Ọ gēdo kwa iru-ya ibia abia n'ike nke ala-eze-ya nile, ndi ziri ezi gēso kwa ya; ọ gēme kwa ihe: ọ bu kwa ada ndinyom ka ọ gēnye ya, ibibi ya; ma ihe ahu agaghi-eguzo, ọ bughi kwa nke ya ka ọ gābu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 11