Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 8:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. Unu agaghi-asi, Nkekọta imegide eze, n'ihe nile nke ndi nka nāsi, Ọ bu nkekọta imegide eze; unu agaghi-atu kwa egwu ihe ha nātu egwu ya, unu agaghi-ama-kwa-ra ya jijiji.

13. Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya ka unu gēdo nsọ; Ya onwe-ya buru kwa ihe unu nātu egwu, Ya onwe-ya buru kwa ihe nēme ka unu ma jijiji.

14. Ọ gāghọ kwa ebe nsọ; ma Ọ gāghọrọ ulo abua nke Israel nkume ikpọbì-ukwu na oké nkume isu-ngọngọ, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem ib͕udu na ọnyà.

15. Ọtutu nime ha gāsu kwa ngọngọ, we da, ewe tipia ha, ha gāma kwa n'ọnyà, ewe nwude ha.

16. Kechie ihe-àmà, kà iwu akàrà n'etiti ndi-nmutam.

17. M'gēchere kwa Jehova, Nke nēzonari ulo Jekob iru-Ya, m'gēle kwa anya Ya.

18. Le, mu onwem na umu nke Jehova nyeworom ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube n'etiti Israel site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'ugwu Zaion.

19. Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?

20. Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adighi-ekwu dika okwu a si di, n'ezie ọ dighi chi-ọbubọ diri ha.

21. Ha gāgabiga kwa n'etiti ya, na nkpà na agu: ọ gēru kwa, mb͕e agu nāgu ha, na ha gākpasu onwe-ha iwe, ji eze-ha, ji kwa Chineke-ha, kọcha nkọcha, ha gēche iru n'elu:

22. ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 8