Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 62:4-12 Bible Nso (IGBOB)

4. Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.

5. N'ihi na dika nwa-okorọbia si aluru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, otú a ka umu-gi ndikom gālu gi: ọzọ, dika obi-utọ nke onye nālu nwunye ọhu nwere n'aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n'aru gi.

6. N'elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M'doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,

7. unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n'uwa.

8. Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N'ezie M'gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n'ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu bayere ya:

9. kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile.

10. Gabiganu, gabiganu n'ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n'elu ndi nile di iche iche.

11. Le, Jehova emewo ka anuru ya rue nsọtu uwa, si, Sinu ada Zaion, Le, nzọputa-gi abiawo; le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya.

12. Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 62