Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 54:7-16 Bible Nso (IGBOB)

7. N'otù ntabi-anya di ntà ka M'rapuworo gi arapu; ma obi-ebere nile di uku ka M'gēji chikọta gi.

8. Na nrubiga-ókè nke iwe ka M'zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M'gēji nwe obi-ebere n'aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri.

9. N'ihi na otú miri nke Noa ka nka dirim: n'ihi na dika M'ṅuru iyi, si na miri nke Noa agaghi-erubiga kwa uwa ọzọ, otú a ka M'ṅuworo iyi, si na M'gaghi-ewesa gi iwe, na M'gaghi-abasiri gi nba ike.

10. N'ihi na ugwu nile gāpu n'ọnọdu-ha, agēwezuga kwa ugwu ntà nile n'ọnọdu-ha; ma eberem agaghi-esi n'ebe i nọ pua, agaghi-ewezuga kwa ọb͕ub͕a-ndu nke udo nkem n'ọnọdu-ya, ka Onye nwere obi-ebere n'aru gi siri, bú Jehova.

11. Gi nwanyi ewedara n'ala, nke oké ifufe nēfeghari, nke anākasighi obi, le, Mu onwem gēdo nkume-gi nile n'ihe-ichọ-nma, were nkume sapphire tọ ntọ-ala-gi.

12. M'gēme kwa ka elu akuku ulo-gi nile ghọ nkume ruby, me kwa ka ọnu-uzọ-ama-gi nile ghọ nkume carbuncle, me kwa ka ókè-ala-gi nile ghọ nkume di iche iche anāchọsi ike.

13. Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.

14. N'ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n'ebe di anya, n'ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n'ebe di anya, n'ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso.

15. Le, ọ buru na onye ọ bula akpalie ise-okwu megide gi, o siteghi na Mu: onye ọ bula nke kpaliworo ise-okwu n'ebe i nọ gāda ada n'ihi gi.

16. Le, Mu onwem ekèwo uzú nke nāfù ọku icheku, nākpu ihe-ọlu iji lu ọlu nke aka ya; Mu onwem ekèwo kwa onye-nbibi imebi emebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 54