Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 54:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri.

2. Me ka ebe ulo-ikwū-gi sa mbara, ka ha seti kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibi-gi nile; eb͕ochila: me ka udọ̀-gi nile di ogologo, me kwa ka ǹtú-gi nile di ike.

3. N'ihi na n'aka-nri na n'aka-ekpe ka i gāb͕asa; nkpuru-gi gēnweta kwa mba di iche iche, ọ bu kwa obodo di iche iche nke tọb͕ọrọ n'efu ka ha gēme ka madu biri nime ha.

4. Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.

5. N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 54