Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 51:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Welienu anya-unu le elu-igwe, legide-kwa-nu uwa di n'okpuru: n'ihi na elu-igwe gāpu n'anya dika anwuru-ọku, uwa gāka kwa nká dika uwe, ndi bi ya gānwu kwa dika anwu ntà: ma nzọputam gādiru mb͕e ebighi-ebi, agaghi-ebibi kwa ezi omumem.

7. Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n'obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha.

8. N'ihi na nla gērichapu ha dika uwe, aruru gērichapu kwa ha dika aji-anu: ma ezi omumem gādiru mb͕e ebighi-ebi, nzọputam gādiru kwa ọb͕ọ nile.

9. Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri?

10. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke meworo ka oké osimiri tasia, bú miri nke ob͕u-miri riri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọ uzọ ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha gēsi gabiga?

11. Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.

12. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 51