Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 48:6-15 Bible Nso (IGBOB)

6. I nuwo ya; gi le ihe a nile; unu onwe-unu kwa, ùnu agaghi-egosi ya? Emewom ka i nuru ihe ọhu di iche site n'ub͕u a, bú ihe echebeworo na nzuzo, nke i nāmaghi.

7. Ub͕u a ka ekèworo ha, ọ bughi site na mb͕e ochie; ọzọ, tutu ubọchi ta erue i nughi kwa ha;ka i we ghara isi, Le, amaram ha.

8. Otú ọ di, i nughi; i maghi kwa; site kwa na mb͕e ochie nti-gi egheghi oghe: n'ihi na amaram na i nāghọb͕u nke-uku, ọzọ, Onye nējehie ejehie site n'afọ nne-ya, ka anākpọ gi.

9. N'ihi aham ka M'nēme ka iwem nọ ọdù, ọ bu kwa n'ihi otutom ka M'nēb͕ochi ya n'ebe i nọ, ka M'we ghara ibipu gi.

10. Le, anuchawom i, ma ọ bughi dika ọla-ọcha; arọputawom i n'oké ọku nke iweda-n'ala.

11. N'ihi Mu onwem, n'ihi Mu onwem, ka M'gēme ya; n'ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum.

12. Gem nti, Jekob, na Israel, bú onye M'kpọworo: Mu onwem bu Onye ahu; Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu.

13. E, akam atọwo ntọ-ala uwa, ọ bu kwa aka-nrim setipuworo elu-igwe: ọ buru na Mu onwem akpọ ha gēguzo ọtọ n'otù.

14. Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.

15. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, ekwuwo okwu; e, akpọwom ya: emewom ka ọ bia, ọ gēme kwa ka ije-ya ga nke-ọma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 48