Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 47:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.

10. I we tukwasi obi n'ihe ọjọ gi; i siwo, Ọ dighi onye nāhum; amam-ihe-gi na ihe-ọmuma-gi, nke ahu emewo ka i laghachi azu: i we si n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem.

11. Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.

12. Biko, guzo n'ọlu dibia-nrafu nile i nālu, na n'ọtutu mb͕asi-gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha site na mb͕e i nọ na nwata; eleghi anya i gēnwe ike ibà urù, eleghi anya i geme ka madu ma jijiji.

13. Ike agwuwo gi n'ọtutu ndum-ọdu-gi: biko, ka ha guzo ọtọ, we zọputa gi, bú ndi nēkè elu-igwe, ndi nēlegide kpakpando, ndi nēme ka amara kwa-ọnwa ihe gēme, n'ihe gābiakwasi gi.

14. Le, ha di ka ahihia-ọka kpọrọ nku; ọku erewo ha; ha agaghi-anaputa onwe-ha n'aka ire ọku: ọ bughi icheku-ọku nēre ere iji nya ọku, ọ bughi kwa ọku inọdu n'iru ya.

15. Otú a ka ha diri gi, bú ihe nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha: ndi gi na ha nāzu ahia site na mb͕e i di na nwata awaghariwo, onye ọ bula rue ofè nke ya; ọ dighi onye nāzọputa gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 47