Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 31:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!

2. Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe.

3. Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi.

4. N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.

5. Dika umu-nnunu nēfe efe, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi Jerusalem; nēb͕ochi nānaputa; nāgabiga nēme ya ka o wepuga onwe-ya.

6. Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 31