Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 25:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.

7. Ọzọ, n'ugwu a ka Ọ gēloda iru ihe-nfuchi ahu eji afuchi ndi nile di iche iche, na ihe-nkpuchi ahu eji ekpuchi mba nile.

8. O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.

9. Agāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya.

10. N'ihi na aka Jehova gānọgide n'ugwu a, ewe zọda Moab n'ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu.

11. Ọ gāb͕asa kwa aka-ya abua n'etiti ya, dika onye nēgwu miri si ab͕asa aka-ya igwu miri: ma Ọ gēme ka npako-ya di ala, ya na ọlu-aghughọ nile nke aka-ya abua.

12. Ọzọ, ebe ewusiri ike nke ulo-elu nke mb͕idi-gi nile ka O budaworo, me ka ọ di ala, me ka ọ darue ala, ọbuná rue ájá.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 25