Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 25:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, Chinekem ka I bu; m'gēme ka I di elu, m'gēkele aha-Gi; n'ihi na I mewo ihe-ebube, bú ndum-ọdu di iche iche site na mb͕e di anya gara aga, n'ikwesi-ntukwasi-obi na ezi-okwu.

2. N'ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya.

3. N'ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi.

4. N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.

5. Dika okpom-ọku n'ebe kpọrọ nku, otú a ka I gēme ka nkpọtu nke ndi ala ọzọ darue ala; dika okpom-ọku site na ǹdò nke igwe-oji, otú a ka agēweda abú ọma nke ndi nēme ka madu ma jijiji.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 25