Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 21:14-16 Bible Nso (IGBOB)

14. Izute onye akpiri nākpọ nku kutanu miri; unu ndi bi n'ala Tima, werenu nri kwesiri ya zute onye nāwaghari.

15. N'ihi na n'iru ọtutu mma-agha ka ha siri wagharia, n'iru mma-agha amiputara amiputa, na n'iru uta azọrọ ukwu ikwe ya, na n'iru ibu di arọ́ agha bu.

16. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 21