Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 15:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. Obim nētiri Moab nkpu; ndi-ọ̀sọ́-ya, nāb͕a ọsọ rue Zoa, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na nrigo Luhit, o ji ikwa-ákwá arigo na ya; n'ihi na n'uzọ Horonaim ka ha nētisi nkpu ntikpọ ike.

6. N'ihi na miri Nimrim gābu nání ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na ahihia akpọnwuwo, ahihia ndu agwusiwo, akwukwọ ndu adighi.

7. N'ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara, na ihe ha kpakọbaworo, n'ofè iyi osisi willow ka ha gēbulaga ha.

8. N'ihi na iti-nkpu adazuwo udà n'ókè-ala Moab buruburu; n'Eglaim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo, ọ bu kwa na Bia-ilim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo.

9. N'ihi na miri Dimon juputara n'ọbara: n'ihi na M'gātukwasi kwa n'aru Dimon ihe ọzọ, ndi Moab nke b͕apuru ab͕apu ka M'gātukwasiri ọdum, tukwasi-kwa-ra ndi ala-ha fọduru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 15