Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 13:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi nke a-aka nile gākuda, obi ọ bula nke madu gālọ kwa ya miri:

8. ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n'ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu.

9. Le, ubọchi Jehova, bú ubọchi nēnweghi obi-ebere, nābia, ya na nrubiga-ókè nke iwe na iwe di ọku; ime ka ala nka ghọ ebe tọbọrọ n'efu na ikpochapu ndi-nmehie nime ya.

10. N'ihi na kpakpando nile nke elu-igwe na Oriọna-ha nile agaghi-eme ka ìhè-ha nwue: anyanwu gāb͕a ọchichiri n'ọwuwa-ya, ọzọ, ọnwa agaghi-eme ka ìhè-ya tie.

11. M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.

12. M'gēme ka madu di ukọ kari ọla-edo anuchara anucha, ọbuná madu efu kari ọla-edo ọma nke Ofia.

13. N'ihi ya ọbuná elu-igwe ka M'gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n'Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n'ubọchi iwe-Ya di ọku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 13