Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 13:19-22 Bible Nso (IGBOB)

19. Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.

20. Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n'ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n'ebe ahu.

21. Ma anu-ọhia di iche iche bi n'ala kpọrọ nku gāmakpu n'ebe ahu; ulo-ha gējuputa kwa n'okwukwu; enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu, nkpi gāmali kwa elu n'ebe ahu.

22. Anu-ọhia nēbe ebe gāzarita kwa onwe-ha n'ulo ọma ya nile, nkita-ọhia kwa n'ulo uku nile nke ihe-utọ: mb͕e-ya di kwa nso ibia, agaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 13