Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 10:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu gādiri ndi nātọ ukpuru di iche iche nke ajọ ihe, na ndi-ode-akwukwọ nke deworo nmeb͕u n'akwukwọ:

2. iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha!

3. Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n'ubọchi nleta, na n'ila-n'iyì nke gēsi n'ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu?

4. Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 10