Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 98:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Bùkuenu Jehova abù ọhu;N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche;Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.

2. Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya:N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.

3. O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di:Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.

4. Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile:Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.

5. Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma;Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.

6. Chirinu opì na olu opì-ikeTisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 98