Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 94:4-15 Bible Nso (IGBOB)

4. Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu:Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.

5. Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.

6. Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa,Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.

7. Ha we si, Ja agaghi-ahu,Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.

8. Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel:Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?

9. Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?

10. Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?

11. Jehova mara èchìchè madu,Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.

12. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja,Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;

13. Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ,Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.

14. N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka,Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.

15. N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume:Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 94