4. Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu:Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.
5. Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.
6. Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa,Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.
7. Ha we si, Ja agaghi-ahu,Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.
8. Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel:Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?
9. Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?
10. Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?
11. Jehova mara èchìchè madu,Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.
12. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja,Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;