Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 91:2-13 Bible Nso (IGBOB)

2. M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike;I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.

3. N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà,Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.

4. Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi,Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba:Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.

5. I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali,Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;

6. Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri,Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.

7. Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi;Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi;Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.

8. Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide,We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.

9. N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm;N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;

10. Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi,Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.

11. N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi,Idebe gi n'uzọ-gi nile.

12. N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi,Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.

13. Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu:I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 91