Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 91:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu,Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

2. M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike;I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.

3. N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà,Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.

4. Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi,Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba:Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 91