Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 89:3-13 Bible Nso (IGBOB)

3. Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu,Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi;

4. Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike,M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah

5. Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova;Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ.

6. N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova?Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke?

7. Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ,Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu.

8. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,Ònye di ike dika Gi, Ja?Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.

9. Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri:Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.

10. Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u;I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi.

11. Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa:Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha.

12. Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha:Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.

13. Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya:Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 89