Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 79:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.

7. N'ihi na ha eripiawo Jekob,Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

8. Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.

9. Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi:Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.

10. N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ?Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi,Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.

11. Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi;Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 79