Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 79:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi;Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ;Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.

2. Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri,Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.

3. Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem;Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.

4. Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.

5. Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi?Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?

6. Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.

7. N'ihi na ha eripiawo Jekob,Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

8. Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 79