Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 78:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndim, ǹanu nti n'iwum:Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum.

2. M'gāsaghe ọnum n'itu ilu:M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:

3. Nke ayi nuworo mara kwa,Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.

4. Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha,Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova,Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo.

5. O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob,O do-kwa-ra iwu n'Israel,Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu,Ime ka umu-ha mara ha:

6. Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu;Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu:

7. Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke,Ghara ichezọ omume nile nke Chineke,Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:

8. Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha,Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi;Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha,Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.

9. Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta,Ma ha chighariri n'ubọchi agha.

10. Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke,Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;

11. Ha we chezọ omume-Ya nile,Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.

12. N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu,N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.

13. O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.

14. O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.

15. Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.

16. O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.

17. Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya,Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 78