Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 77:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di:Ònye bu chi uku dika Chineke?

14. Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu:I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche.

15. I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi,Bú umu Jekob na Josef. Selah

16. Miri huru Gi, Chineke;Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u:Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.

17. Igwe-oji nile wupuru miri;Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà:Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.

18. Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu;Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.

19. N'oké osimiri ka uzọ-Gi di,Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri,Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 77