Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 76:2-11 Bible Nso (IGBOB)

2. Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.

3. N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta;Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah

4. Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru.

5. Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha;Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.

6. Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob,Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.

7. Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu:Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?

8. I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé;Uwa turu egwu, we di jū,

9. Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe,Izọputa ndi nile di ume-ala n'obi nke uwa. Selah

10. N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi:I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.

11. Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu:Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 76